NTULERIKOTA OLUNDI ACHI NA IGBO IZUGBE

[featured_image]
Download
Download is available until [expire_date]
  • Version
  • Download 254
  • File Size 138KB
  • File Count 1
  • Create Date November 30, 2017
  • Last Updated November 30, 2017

NTULERIKOTA OLUNDI ACHI NA IGBO IZUGBE

Asusu obula di n’uwa nwere olundi e jiri mara ya. Asusu Igbo, dika otu n’ime asusu ato e nwere na Naijiria nwere olundi di iche iche ma nwekwaa Igbo Izugbe e jiri mara obodo niile na-asu asusu Igbo. N’edemede nchocha a nke isi okwu ya bu Ntulerikota olundi Achi na nke Igbo Izugbe, e lebara anya n’olundi Achi iji choputa myiri na ndiiche di n’etiti ya na Igbo Izugbe. Nwanchocha malitere site n’inye nkowa banyere ebe isiokwu a gbadoro ukwu. E nyere nkowa banyere olundi na Igbo Izugbe putara. A kowakwara abumnobi nchocha a nke gunyere ikwalite asusu Igbo. E metutakwara aka n’uru di iche iche nchocha a baara nwanchocha, umuakwukwo, ndinkuzi ndi ga-agu ya n’odinihu na ndi ga-eme nchocha nay a tinyere ndi nwere mmasi n’asusu Igbo. Nihi na nchocha nke e mere bu nke sovee, nwanchocha gara n’ogbe iri na abuo di n’Achi gbaa ndi okenye ajuju onu. E kere ndi maara aguede akwukwo ajuju nke ha zakwara. A kowakwara maka okere nchocha ebe a noro kowaputa na o bu naani Igbo a suru asu ka agbadokariri ukwu ihi choputa ihe digasi mkpa banyere olundi Achi. E deputakwara ajuju niile a juru ndi e jiri mee nchocha kesaa ha nye ndi nwere ike igu ha dika nid nkuzi na umuakwukwo. E ziputakwara otutu nnyocha ihe e derela banyere isiokwu nakwa nnyocha edemede nchoputa bu ndi e sitere n’akwukwo agumagu di iche iche e biputara ebiputa nwetasia nwanchocha lebakwara anya n’ihe gbasara usoro nchocha e mere bu ebe o noro wee rutu aka n’ihe e banyere udidi nchocha ebe ndi a noro mee chocha, ndi e jiri mee nchocha, nsere na usoro nsere nchocha, ngwa oru di iche iche e jiri mee nchocha. E tuchara ihe niile a choputara banyere olundi Achi ma tulerikota ya na Igbo Izugbe. Nwanchocha mechara chikota ihe niile o mere na nchocha a, tunyekwuo aro eti a ga-esi site n’ileba anya n’olundi di iche iche e nwere n’asusu Igbo mee ka asusu Igbo were onodu ua dike asusu tozuru etozu.

 

BY  UZOCHUKWU CATHERINE OYIBOKA, NGALABA AMUMAMU AFRIKA NA ESHIA NKE MAHADUM NNAMDI AZIKIWE, OKA IJI MEZU NCHORONNWETA ASAMBO